Acts 23:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a, lee ihe anyị chọrọ ka unu meere anyị. Gwanụ ọchịagha ka ọ kpọpụta Pọl ọzọ nꞌihi na unu chọrọ ka nzukọ kpee ya ikpe. Meenụ dị ka unu nwere ajụjụ dị mkpa unu chọrọ ịjụ ya. Anyị ga-ejikere igbu ya nꞌụzọ.”
Igbo 2006
Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.”