Acts 23:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma aṅala ha ntị. Nꞌihi na ihe dị ka iri mmadụ anọ ga-ezo onwe ha na-eche mpụta unu. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla tutuu Pọl abụrụ onye nwụrụ anwụ.”
Igbo 2006
Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n'ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n'etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.”