Acts 23:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma mgbe m nụrụ ihe banyere izuzu ọjọọ ha na-agba ịla ndụ ya nꞌiyi, ekpebiri m izitere gị ya ka ọ dịrị ndị na-ebo ya ebubo mfe ikwu ihe o mere nꞌihu gị.”
Igbo 2006
Ma mb͕e egosirim na agāb͕a ajọ ìzù megide nwoke a, ngwa ngwa m'we zitere gi ya, nye kwa ndi nēbo ya iwu ka ha kwugide ya okwu n'iru gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha.