Acts 23:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Pọl zara ha sị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m, na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ọ dịghị mma ikwu okwu ọjọọ megide ndị na-achị achị.”
Igbo 2006
Pọl we si, Amataghm, umu-nnem, na ọ bu onye-isi-nchu-àjà: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ekwula okwu ọjọ megide onye-isi ọ bula nke ndi nke gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’ ”