Acts 24:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Emesịa, Feliks feere Pọl aka ka o bilie kwuo okwu. Pọl siri otu a bido. “Amaara m nna anyị, na ị bụrụla onye ọkaikpe nꞌihe gbasara ndị Juu site nꞌogologo afọ ndị a gara aga. Nke a na-enye m ntụkwasị obi mgbe m na-asa ọnụ m.
Igbo 2006
Mb͕e onye-isi ahu fesiri ya aka ikwu okwu, Pọl we za, si, Ebe m'mara na i bu onye-ikpé nye mba nka ọtutu arọ gara aga, ewerem obi-utọ nāgọpu onwem:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.