Acts 24:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ị ga-achọpụtakwa na ndị Juu ahụghị m ka mụ na onye ọ bụla na-ese okwu, ma ọ bụ na o nwere ebe m kpatara aghara nꞌime ụlọ nzukọ, ma ọ bụ ebe ọ bụla nꞌime obodo.
Igbo 2006
ha ahughm kwa ka m'nāgwa madu ọ bula okwu ma-ọbu ikpaliri ìgwè madu nime ulo uku Chineke, ma-ọbu nime ulo-nzukọ, ma-ọbu nime obodo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo.