Acts 24:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe a kpọbatara Pọl, Tatulọs pụtara guzo kwuo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka gị Feliks bụ. I nyela anyị ndị Juu ahụ udo. I meela ka anyị hapụ ịbụkwa ndị a na-eleda anya.
Igbo 2006
Mb͕e akpọrọ ya, Tatọlọs we malite ibo ya ebubo, si, Ebe ayi sitere n'aka-gi nwe udo ri nne, ebe esite-kwa-ra n'ezi uche, nke i ji buru uzọ zube ihe, nēmeziri mba nka ihe di iche iche,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a.