Acts 24:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Feliks onye maara nke ọma ihe nile banyere ndị na-eso ụzọ Kraịst yigharịrị ikpe a. Ọ gwara Pọl na ndị na-ebo ya ebubo sị, “Aga m eleba anya nꞌikpe a mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”
Igbo 2006
Ma ebe Filiks matara ihe bayere Uzọ Jisus nke-ọma kari, ọ gwa ha ka ha chere, si, Mb͕e ọ bula onye-isi-ọchi-agha, bú Lisias, gāridata, m'gātule okwu-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”