Acts 24:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma mgbe Pọl gara nꞌihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dịrị mmadụ ijide onwe ya aka nꞌihe ọ bụla ọ na-eme, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nꞌoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ gwara Pọl okwu sị ya, “Ị nwere ike ịpụ ugbu a, Aga m akpọkwa gị nꞌoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
Igbo 2006
Mb͕e ọ nēkwu okwu bayere ezi omume, na imerū ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu, o we za, si, Ga nke gi n'oge a; mb͕e m'nwere oge m'gākpọ kwa gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”