Acts 24:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-ewetakarị aghara, onye ọrụ ya bụ ikwagide ndị Juu nọ nꞌebe nile nꞌụwa a ka ha nupụ isi. Ọ na-akpali ọgba aghara megide ọchịchị ndị Rom. Ọ bụkwa onyeisi ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu onye Nazaret.
Igbo 2006
N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.