Acts 25:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesịrị ọnwụ, akwadoro m ịnwụ. Ma ọ bụrụ na aka m dị ọcha, gị, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ enweghị ike ịrara m nye nꞌaka ndị Juu ka ha gbuo m. Ana m akpọku Siza ka o lenye anya nꞌikpe m.”
Igbo 2006
Ya mere ọ buru na emem ajọ omume, ọ buru kwa na emewom ihe kwesiri ọnwu, ariọghm ib͕anari ọnwu: ma ọ buru na ọ dighi ihe bu ezi-okwu n'ebubo ndikom ndia nēbom, ọ dighi onye ọ bula puru iwerem nye ha n'amara. Ọ bu Sisa ka m'nākpọku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.”