Acts 25:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ gwara Pọl sị, “Ị chọrọ ka Siza lenye anya nꞌikpe gị, ọ dị mma, ị ga-ahụkwa Siza.”
Igbo 2006
Mb͕e ahu Festọs, mb͕e ya na nnọkọ-ikpé-ya b͕asiri ìzù, ọ zara, si, I kpọkuwo Sisa: ọ bu Sisa ka i gāgakuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”