Acts 25:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, nꞌechi ya, Agripa na Benaisị rutere nꞌụlọ ikpe nꞌoke nganga. Ọtụtụ ndị isi agha na ndị a maara aha ha nꞌobodo a sooro ha. A kpọbatakwara Pọl.
Igbo 2006
Ya mere echi-ya, mb͕e Agripa biara, ya na Banaisi, n'oké ebube, bata kwa n'ulo ọnunu-okwu, ha na ndi-isi-ọchi-agha, na ndikom amara aha-ha n'obodo ahu, mb͕e Festọs kwuru ewe kuta Pọl.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl.