Acts 25:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ka Festọs kwuru okwu sị, “Eze Agripa na ndị nile soro ya nọkọọ. Nke a bụ nwoke ahụ ndị Juu bi nꞌobodo a na ndị Juu bi na Jerusalem na-achọsi ọnwụ ya ike.
Igbo 2006
Festọs we si, Eze Agripa, na ndikom nile ayi na unu nọ n'ebe a, unu ahuwo onye a, onye ọra ndi-Ju nile riọrọm aririọ bayere ya, ma na Jerusalem ma n'ebe a, nēti nkpu na ọ di nkpà ka ọ ghara idi ndu ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ.