Acts 25:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma enweghị m ihe ọ bụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nꞌihu unu nile. Karịsịa nꞌihu gị onwe gị eze Agripa ka i lee anya nꞌime okwu a gwa m ihe m ga-edere Siza.
Igbo 2006
Ma enweghm okwu di itukwasi obi bayere ya idegara onye-nwem. N'ihi ya ekuputaram ya n'iru unu, ma nke ka n'iru gi onwe-gi, Eze Agripa, ka, mb͕e ekpesiri ya ikpé, ka m'we nwe ihe m'gēde n'akwukwo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma enweghị m ihe ọbụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nʼihu unu niile, ma karịsịa nʼihu gị onwe gị eze Agripa, ka ọ ga-abụ anyị tulesịa ihe banyere ya, ka m nwee ihe m ga-ede.