Acts 26:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Etinyere m ọtụtụ ndị na-eso ụzọ a bi na Jerusalem nꞌụlọ mkpọrọ, site nꞌike m natara nꞌaka ndị isi nchụaja. Mgbe a mara ndị ha ikpe ọnwụ, ana m akwagide ka e gbuo ha.
Igbo 2006
Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a ka m mere na Jerusalem. Ọ bụghị naanị na m natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja jiri ya kpọchie ọtụtụ ndị nsọ nʼụlọ mkpọrọ, ewelikwara m aka elu nʼoge a na-ama ha ikpe ọnwụ.