Acts 26:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọtụtụ mgbe atara m ndị na-eso ụzọ a ahụhụ, mekpaa ha ahụ nꞌebe nzukọ ha nile, ime ka ha gọnarị Kraịst. Nꞌihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nꞌobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.
Igbo 2006
Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọtụtụ mgbe ka m hụrụ na a tara ha ahụhụ nʼụlọ nzukọ niile. Agbalịrị m ịkwagide ha ka ha kwuo arụ ma kwutọkwa okwukwe ha. Nʼihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nʼobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.