Acts 26:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anyị nile dara nꞌala. Ma anụrụ m olu na-agwa m okwu nꞌasụsụ Hiburu sị, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-esogbu m? Ị na-enye mkpụrụ obi gị nsogbu!’
Igbo 2006
Mb͕e ayi nile dasiri n'ala, m'we nu otù olu ka ọ nāsim n'asusu Hibru, Sọl; Sọl, gini mere i nēsob͕um? ọ di ike ka i b͕a ndudu eji achu ehi ukwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị niile dara nʼala. Ma anụrụ m olu gwara m okwu nʼasụsụ Hibru, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ site nʼịkpọ ụkwụ na ndụdụ e ji achị ehi.’