Acts 26:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a, bilie ọtọ! Nꞌihi na ahọpụtala m gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa nile mara ihe banyere nzute i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị.
Igbo 2006
Ma bilie, guzo kwa n'ukwu-gi: n'ihi na emere ka i hum anya ka M'we me ihe a, irọputa gi ka i buru onye nēje ozi na onye-àmà nke ihe i hurum nime ha, na nke ihe M'gēme ka i hum anya nime ha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, bilie, kwụrụ ọtọ! Nʼihi na-emere m ka ị hụ m anya, ka m họpụta gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa niile mara ihe banyere nzute a i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị.