Acts 26:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Dị ka ndị Juu maara nke ọma, esitere m na nwanta nwee ọzụzụ nke ibi obi ndị Juu nꞌobodo anyị bụ Tasọs, emesịakwa, na Jerusalem. Ebikwara m obi dị ka onye Juu.
Igbo 2006
Ya mere, ndi-Ju nile matara ibi-obim site na nwata, nke sitere na mbu di n'etiti mba nke akam, na nime Jerusalem;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem.