Acts 27:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
E mere njikere ikpeazụ banyere iji ụgbọ mmiri gaa Rom. Ya mere, e mere ka Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nwee onye ga-elekọta ha. Aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha so nꞌotu ndị agha pụrụ iche eze nwere.
Igbo 2006
Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.