Acts 27:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Ọnụ Mmiri Ọma abụghị ọnụ mmiri dị ezi mma, ebe kwesịrị ekwesị ịnọdụ nꞌoge oyi. Nꞌihi ya ndị na-eso ụgbọ ahụ họọrọ ịga nꞌihu ịgbalị iru Fonikisi ka ha nọdụ nꞌebe ahụ nꞌoge oyi. Ọnụ mmiri Fonikisi dị ezi mma. Ọ na-enwe ezi ikuku nke na-esi nꞌugwu na ndịda.
Igbo 2006
Ebe ọnu-miri ahu nādighi n'ebe di nma inogide na mb͕e oyi, ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha we du ọdú ka enupu ub͕ọ n'ebe ahu, ma eleghi anya ha gēru Finiks, we nọgide n'ebe ahu na mb͕e oyi; nke bu otù ọnu-miri nke Krit, nke nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu n'akuku Ugwu na akuku Ndida.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.