Acts 27:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha nọ na-atụle ihe ndị a, ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda. Nke a mere ka ha chee na ụbọchị ahụ ga-adị mma. Nꞌihi ya ha kwọpụrụ ụgbọ, nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri.
Igbo 2006
Mb͕e ifufe nēfe nwayọ, ebe ha chère na ihe ha nēzube eruwo ha aka, ha we pua nāga n'akuku Krit.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit.