Acts 27:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Oke ifufe ọjọọ ahụ magharịrị ọtụtụ ụbọchị na-enweghị nkwụsị. Eluigwe hujiri ehuji, anyị ahụkwaghị anwụ ma ọ bụ kpakpando ọ bụla anya tutuu ruo nꞌikpeazụ olileanya anyị nile gwụsịrị.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ nādighi anyanwu ma-ọbu kpakpando nāmukwasi ayi ọtutu ubọchi, mb͕e ọ dighi kwa oké ifufe ntà nēfekwasi ayi, ewe wepu olile-anya nile na agāzọputa ayi site n'ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị.