Acts 27:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha matara nꞌoge a na ebili mmiri ahụ ga-eburu anyị gaa nꞌọnụ mmiri. Ma egwu juru ha obi nꞌihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nꞌakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara ụdọ igwe anọ e ji ejide ụgbọ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.
Igbo 2006
Ebe ha nātu egwu ma eleghi anya miri gātupu ayi n'ala nkume, ha we rada arilika anọ n'isi ub͕ọ, we kpe ekpere ka chi we bọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.