Acts 27:40 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌikpeazụ ha kpebiri ịgbalị ike ha. Ha chabiri ụdọ igwe nwere ike ijide ụgbọ ahụ, hapụ ha nꞌime osimiri. Ha wedatara ụmara e ji anyagharị ụgbọ, weliekwa akwa ifufe, meekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nꞌelu ala.
Igbo 2006
Mb͕e ha tupusiri arilika nile, rapu kwa ha n'oké osimiri, ha we tọpu udọ̀ umara isi-ub͕ọ n'otù oge ahu; ha we dọlie ákwà-ifufe nke ọnu-ub͕ọ nye ifufe, we jebe n'ótú.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala.