Acts 27:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anyị nwere ọtụtụ ụbọchị nke na-enyeghị anyị ahụ udo. Nꞌoge anyị na-erute nso Snidus, oke ifufe bidoro ifesi ike. Anyị enwekwaghị ike ịga nꞌihu nꞌụzọ ahụ. Nꞌihi ya anyị chigharịrị ihu site ụzọ ọnụ mmiri Salmone.
Igbo 2006
Mb͕e ayi gasiri nwayọ ọtutu ubọchi, mb͕e ọ di kwa ayi ike iru na ncherita-iru Naidọs, ebe ifufe nēkweghi ka ayi ga n'iru ọzọ, ayi we nāga ala Krit nso, na ncherita-iru Salmoni;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee.