Acts 28:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị nọrọ ihe dị ka ọnwa atọ nꞌagwa etiti ahụ tutuu anyị anyalie ụgbọ. Nꞌoge a ọ bụ ụgbọ a na-akpọ Ejima nke sitere Alegzandria bịa nọọ nꞌagwa etiti ahụ nꞌoge oyi ka anyị soro pụọ.
Igbo 2006
Mb͕e ọnwa atọ gasiri ayi we ba n'ub͕ọ Aleksandria nupu, bú ub͕ọ nke nọgidereri n'agwe-etiti ahu na mb͕e oyi, nke ihe-iriba-ama-ya bu, Umu-nne-ndikom abua amuru n'otù mb͕e.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus.