Acts 28:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụmụmma anyị nọ na Rom nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara chere anyị nꞌebe a na-akpọ Forum, nꞌahịa dị nꞌụzọ Apịa. Ndị ọzọ zutere anyị nꞌebe ọzọ a na-akpọ Ụlọ ndị ije. Mgbe Pọl hụrụ ha o kelere Chineke ma nweekwa obi ike.
Igbo 2006
Umu-nna-ayi nime Kraist, mb͕e ha nuru ihe bayere ayi, ha we bia izute ayi rue Ahia Apiọs, na Ulo-ndi-ije Atọ: mb͕e Pọl huru ha, o kele Chineke, nwe kwa obi-ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ụmụnna anyị nọ nʼebe ahụ nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara zute anyị nʼụzọ Apiọs na nʼụlọ ndị Ije atọ. Mgbe Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma bụrụ onye a gbara ume.