Acts 28:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Pọl ziri ozi ka a kpọọrọ ya ndị isi ndị Juu bi nꞌobodo a. Ọ gwara ha okwu sị, “Ụmụnna m, ọ bụ ndị Juu bi na Jerusalem jidere m nyefee m nꞌaka ndị ọchịchị obodo Rom ka e kpee m ikpe. Ọ bụ ezie na emekpaghị m onye ọ bụla ahụ, emerụkwaghị m omenala nna anyị ha.
Igbo 2006
O rue, na mb͕e ubọchi atọ gasiri ọ kpọkọrọ ndi bu ndi-isi n'etiti ndi-Ju: mb͕e ha biakọrọ n'otù, ọ si ha, Umu-nnem, mu onwem, ọ bu ezie na emeghm ihe ọ bula megide ndi-Ju, ma-ọbu ọme-n'ala nke nna-ayi-hà, ma esi na Jerusalem raram nye n'aka ndi Rom ka m'buru onye-nkpọrọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom.