Acts 28:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Akpọrọ m unu taa ka mụ na unu hụkọọ ka unu matakwa na anọ m nꞌagbụ nꞌihi okwukwe m kweere na Onye nzọpụta abịala.”
Igbo 2006
Ya mere n'ihi ihe nka ka m'riọrọ unu ka m'hu unu anya gwa kwa unu okwu: n'ihi na ọ bu n'ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.”