Acts 28:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị Juu ahụ zara ya sị, “Anyị anataghị ozi ọ bụla banyere gị. Anyị anụbeghị akụkọ ọ bụla site na Judia ma ọ bụ okwu ọjọọ ọ bụla site nꞌọnụ ndị isi na Jerusalem banyere gị.
Igbo 2006
Ha we si ya, Ayi onwe-ayi anataghi akwukwọ-ozi site na Judia bayere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti umu-nne-ayi ruru ebe a, we kọ akukọ ma-ọbu kwue ajọ ihe ọ bula bayere gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị.