Acts 28:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha yiri ọnụ mgbe ha ga-abịaghachi. Nꞌụbọchị ahụ, ọtụtụ mmadụ bịara nꞌụlọ ya. Ọ gwara ha banyere alaeze Chineke na Jisọs site nꞌakwụkwọ nsọ. O mere nke a site nꞌakwụkwọ Mosisi na nke ndị amụma. O bidoro izi ha ihe site nꞌụtụtụ ruo anyasị.
Igbo 2006
Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị.