Acts 28:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe ha tụlechara okwu ndị a nꞌobi ha, ha hapụrụ Pọl laa, ma ha bukwa okwu a Pọl kwuru nꞌobi:
Igbo 2006
Mb͕e ha nēnweghi otù olu n'etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n'ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha,