Acts 28:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na obi unu mara abụba, ntị unu adịkwaghị anụ ihe. Unu mechikwara anya unu nꞌebe nghọta dị. Nꞌihi na unu achọghị ịhụ, unu achọghị ịnụ, unu achọkwaghị ịghọta ma lọghachikwute m ka m gwọ unu.’ ”
Igbo 2006
N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’