Acts 28:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ndị obodo a hụrụ agwụ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nꞌaka Pọl ha gwarịtara onwe ha sị, “Onye a bụ ogbu mmadụ, anaghị eji ọkụ enyo ya! Ọ bụ ezie na ọ gbanarịrị mmiri, ma ikpe ziri ezi aghaghị ikpe onwe ya.”
Igbo 2006
Mb͕e ndi ahu ndi nāsu asusu ọzọ huru anu-ọhia ahu ka o kokwasiri ya n'aka, ha we sirita ibe-ha, N'ezie nwoke a bu ob͕u-madu, onye ọ bu ezie na azọputara ya n'oké osimiri, ma Ikpé ziri ezi ekweghi ka ọ di ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.”