Acts 28:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mmadụ ndị a na-ele anya ma aka Pọl ga-aza, ma ọ bụ na Pọl ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na ihe abụọ ndị a emeghị, ha gbanwere obi ha banyere ihe ha na-eche. Ha bidoro iche na Pọl bụ chi.
Igbo 2006
Ma ha nēle anya na ọ gaje iza, ma-ọbu ida n'ala nwua na mberede: ma mb͕e ha nēle anya ogologo oge, ma ha ahughi ihe ọ bula jọrọ njọ mere ya, ha we chègharia uche-ha, si na ọ bu chi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.