Acts 3:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha ghọtara na ọ bụ onye ngwụrọ ahụ, nke na-arịọ arịrịọ nꞌọnụ ụzọ ụlọ nsọ ukwu Chineke. O juru ha anya ịhụ ya ka ọ na-aga ije ọzọ.
Igbo 2006
ha we mata ya, na ọ bu onye ahu nke nọduru n'Ọnu-uzọ-ama Ọma nke ulo uku Chineke inata onyinye-ebere: o we b͕a ha ghari nke-uku, ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, n'ihi ihe emeworo ya-ri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.