Acts 3:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Pita hụrụ ọtụtụ mmadụ ka ha gbara ya gburugburu, ọ gwara ha okwu sị, “Ndị Izirel, gịnị mere ọnọdụ nwoke a ji na-eju unu anya? Unu na-ele anyị anya dị ka ọ bụ anyị onwe anyị mere ka nwoke a gaa ije site nꞌike anyị na ịdị nsọ anyị.
Igbo 2006
Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?