Acts 3:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chineke nke Eberaham, na Aịzik na Jekọb, Chineke nna nna anyị ha, asọpụrụla onyeozi ya Jisọs. Ọ bụ Jisọs ahụ unu nyefere ka e kpee ya ikpe. Jisọs ahụ unu jụrụ nꞌihu Pailet mgbe Pailet kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa!
Igbo 2006
Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.