Acts 3:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ okwukwe nwoke a nwere nꞌaha Jisọs ka e ji mee ka ọ dịkwa ike ọzọ. Unu nile na-ahụ ya. Unu makwaara ya. Ee! Okwukwe ya mere ka ahụ dị ya mma, dị ka unu ji anya unu na-ahụ!
Igbo 2006
Site kwa n'okwukwe ekwere n'aha-Ya ka aha-Ya nyere nwoke a ume, onye unu nēle anya mata kwa: e, okwukwe ahu nke sitere n'aka-Ya mere ka aru-ya dizu nma n'iru unu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.