Acts 3:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha ruru ọnụ ụzọ e si abanye, ha hụrụ otu nwoke e butere dote nꞌọnụ ụlọ nsọ ahụ. Nwoke a dara ngwụrọ. A mụkwara ya nꞌọnọdụ ngwụrọ, site nꞌafọ nne ya. Oge nile ka a na-ebute ya dote ya nꞌọnụ ụzụ ahụ, ka ọ na-arịọ arịrịo. Aha ọnụ ụzọ a, ebe e dotere ya bụ Ọnụ ụzọ ọma.
Igbo 2006
Anēbute kwa otù nwoke nke dara ngwurọ site n'afọ nne-ya, onye ha nātọb͕ọ kwa-ubọchi na nso ọnu-uzọ ahu nke ulo uku Chineke nke anākpọ Ọnu-uzọ Ọma, iriọ onyinye-ebere n'aka ndi nābà nime ulo uku Chineke;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.