Acts 3:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mosisi nꞌonwe ya kwuru nꞌoge nke ya sị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu ga-eme ka onye amụma ọzọ bilie site nꞌetiti unu. Chineke ga-ahọpụta ya dị ka o si họpụta m. Ọ bụ onye ahụ ka unu ga-ege ntị ime ihe ọ bụla ọ gwara unu.
Igbo 2006
Moses kwuru n'ezie, si, Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n'ihe nile, ka ha ra, bù nke Ọ gāgwa unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.