Acts 3:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Unu bụ ndị ketara ozi ndị amụma. Unu ketakwara ọgbụgba ndụ nna nna unu ha na Chineke gbara. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham sị, ‘Site nꞌotu nwa gị ka a ga-agọzi mba nile nke ụwa.’
Igbo 2006
Unu onwe-unu bu umu ndi-amuma, na umu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Chineke na nna-unu-hà b͕ara, mb͕e Ọ siri Abraham, Ọ bu kwa na Nkpuru-gi ka agāgọzi ab͕uru niile nke uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’