Acts 4:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
aga m agwa unu. Ka ụmụ Izirel nile matakwa! A gwọrọ nwoke a guzo nꞌebe a site nꞌike Jisọs Kraịst onye Nazaret. Ọ bụkwa Jisọs ahụ unu kpọgidere nꞌobe, onye Chineke kpọlitere site nꞌọnwụ. Ọ bụ site nꞌike Jisọs Kraịst ka nwoke a ji guzo nꞌihu unu, dị ka onye ahụ zuru oke.
Igbo 2006
ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n'aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n'iru unu n'ebe a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.