Acts 4:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị ikpe ahụ dọkwara ha aka na ntị ọzọ, hapụ ha ka ha laa, ebe ọ bụ na o nweghị iwu ọ bụla ha dara nke pụrụ iwetara ha ahụhụ. Otu ọ dị, ha hapụkwara ha nꞌihi na mmadụ nile na-ekele Chineke ekele nꞌihi ihe a mere.
Igbo 2006
Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.