Acts 4:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ gị mere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu site nꞌọnụ Devidi sị, ‘Gịnị mere mba nile ji na-agbọ ụfụfụ? Gịnị mere ha ji ezube nzube nzuzu imegide gị, Chineke?
Igbo 2006
Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si, N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu, Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “ ‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?