Acts 4:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na Herọd, na Pailet na ndị ụwa nile, na ndị Izirel ezukọtaala imegide Jisọs, Ohu gị dị nsọ, onye ị họpụtara ka ọ bụrụ Onye nzọpụta!
Igbo 2006
n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,