Acts 4:32 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị nile kwere ekwe nwere otu obi. O nweghị onye ọ bụla gụrụ ihe ọ bụla o nwere dị ka nke aka ya. Kama ha mere ka ndị ọzọ keta oke nꞌihe ha nwere.
Igbo 2006
Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n'etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.