Acts 5:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ozi ahụ pụrụ dị ka mmụọ ozi gwara ha. Nꞌisi ụtụtụ ha banyere nꞌụlọ nso ukwu Chineke bido izi ihe. Mgbe e mesịrị, onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, batara nꞌụlọ nzukọ ha. Onyeisi nchụaja kpọrọ nzukọ ndị na-achị achị. Ndị bịara nzukọ a bụ ndị okenye ndị Juu, ndị na-anọchite anya ụmụ Izirel nile. Mgbe ha zukọrọ, onyeisi nchụaja ziri ndị uwe ojii ka ha gaa kpụta ndị ozi site nꞌụlọ mkpọrọ.
Igbo 2006
Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n'ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n'ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha.